20. N'uzọ ezi omume ka m'nēje ije,N'etiti okporo-uzọ nile nke ikpé:
21. Ime ka ndi nāhum n'anya keta ihe di adi,Ka m'we meju kwa ulo-àkù nile ha.
22. Jehova nwerem na nmalite uzọ-Ya,Tutu ọlu-Ya nile site na mb͕e ahu.
23. Site na mb͕e ebighi-ebi ka emerem ka m'guzosie ike, site n'isi-mbu,Tutu uwa adi.
24. Mb͕e ọ dighi ob͕u-miri ọ bula di, amuputaram;Mb͕e ọ dighi isi-iyi ọ bula di nke juputara na miri.
25. Tutu eme ka ntọ-ala ugwu nile bamie n'ala,Tutu ugwu ntà nile adi ka amuputaram:
26. Mb͕e Ọ kēmeghi uwa, ma-ọbu azu obodo,Ma-ọbu nmalite ájá nke elu-uwa dum madu bi.
27. Mb͕e O doziri elu-igwe, n'ebe ahu ka m'nọ:Mb͕e O nyere ukpuru, si, Ka ihe b͕ara buruburu dikwasi n'iru ob͕u-miri:
28. Mb͕e Ọ mere ka mbara-ígwé sie ike n'elu:Mb͕e emere ka isi-iyi nile nke ob͕u-miri di ike:
29. Mb͕e O ji kpara oké osimiri ókè-ya,Ka miri we ghara igabiga okwu-ọnu-Ya:Mb͕e O ji turu ntọ-ala uwa ukpuru:
30. Anọkwam n'akuku Ya, dika onye-ọ̀kà:M'we buru ihe nātọ Ya utọ kwa-ubọchi,Nēgwuri egwú n'iru Ya mb͕e nile;
31. Nēgwuri egwú n'elu-uwa dum madu bi n'uwa-Ya;Ihe nātọm utọ di kwa n'ebe umu madu nọ.
32. Ma ub͕u a, umum, genum nti:N'ihi na ndi ihe nāgara nke-ọma ka ndi nēdebe uzọm nile bu.