18. Àkù na nsọpuru di n'akam;E, àkù nke nādigide na ezi omume.
19. Nkpurum di nma kari ọla-edo ọma, e, kari ọla-edo anuchara anucha;Ihe-omumem di kwa nma kari ọla-ọcha arọputara arọputa.
20. N'uzọ ezi omume ka m'nēje ije,N'etiti okporo-uzọ nile nke ikpé:
21. Ime ka ndi nāhum n'anya keta ihe di adi,Ka m'we meju kwa ulo-àkù nile ha.
22. Jehova nwerem na nmalite uzọ-Ya,Tutu ọlu-Ya nile site na mb͕e ahu.
23. Site na mb͕e ebighi-ebi ka emerem ka m'guzosie ike, site n'isi-mbu,Tutu uwa adi.
24. Mb͕e ọ dighi ob͕u-miri ọ bula di, amuputaram;Mb͕e ọ dighi isi-iyi ọ bula di nke juputara na miri.