Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ilu 7:21-26 Bible Nso (IGBOB)

21. O were ọtutu urà-ya wezuga nwa-okorọbia ahu ka ọ ba n'ulo-ya,O were okwu ire-utọ nke eb͕ub͕ere-ọnu-ya nufue ya.

22. Nwa-okorọbia ahu nējeso ya na mberede,Dika ehi si abia n'ob͕ub͕u-ya,Ma-ọbu dika nkpọrọ-ukwu si abia n'idọ-aka-na-nti nke onye b͕agọrọ ab͕agọ n'uche-ya;

23. Rue mb͕e àkú gēji b͕apue imeju-ya;Dika nnunu si eme ngwa ibà n'ib͕udu,Ma ọ maghi na imegide ndu-ya ka ọ bu.

24. Ma ub͕u a, umum, genum nti,Tọ-kwa-nu nti n'ala n'okwu nile nke ọnum.

25. Ekwela ka obi-gi wezuga onwe-ya ba n'uzọ nile nke nwanyi ahu,Akpafula n'okporo-uzọ-ya nile.

26. N'ihi na ọ di ọtutu ndi emeruru aru ka o meworo ka ha da:E, ndi nwere ume ka ndi-ya nile eb͕uru eb͕u bu.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ilu 7