Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ilu 7:1-16 Bible Nso (IGBOB)

1. Nwam, debe okwu-ọnum nile,Zobe ihe nile m'nyere n'iwu n'ebe i nọ.

2. Debe ihe nile m'nyere n'iwu, we di ndu,Debe kwa iwum dika nwa-anya nke anya-gi.

3. Ke ha na nkpisi-aka-gi nile;De ha n'elu mbadamba nkume, bú obi-gi.

4. Si amam-ihe, Nwa-nnem nwanyi ka i bu;Kpọ kwa nghọta nwanyi i mara nke-ọma:

5. Ka ha we debe gi ka i pua n'aka nwanyi nābughi nwunye-gi,N'aka nwanyi nābughi nwunye-gi nke nēkwu okwu ire-utọ.

6. N'ihi na na window nke ulomN'oghere-inara-ifufem ka m'lepuru anya;

7. M'we hu n'etiti ndi nēnweghi uche,M'mata n'etiti umu-ndikom,Otù nwa-okorọbia nke obi amam-ihe kọrọ,

8. Ka ọ nāgabiga n'amá na nso nkuku nwanyi ahu,Ọ bu kwa n'uzọ ulo-ya ka ọ nāzọ ije;

9. Na chi-ojiji, n'anyasi nke ubọchi,Nime nb͕achi nke abali na ọchichiri.

10. Ma, le, otù nwanyi zutere yaYiri uwe nke nwanyi nākwa iko, ọ bu kwa onye echeworo obi-ya.

11. Onye nēme nkpọtu ka ọ bu, buru kwa onye nēwezuga onwe-ya;Ọ bughi n'ulo-ya ka ukwu-ya nānọ:

12. Ub͕u a n'èzí ka ọ nọ, ub͕u a ọ bu n'amá nile,Ọ bu kwa na nso nkuku nile ọ bula ka ọ nēche anwu.

13. Nwanyi ahu we jide ya aka, sutu kwa ya ọnu,Were iru ihere nādighi si ya:

14. Ihe àjà nile nke àjà-udo di n'akam;Ta ka m'kwughachiworo ihe nile m'kwere na nkwa.

15. N'ihi nka ka m'putara izute gi,Ichọsi iru-gi ike, m'we chọputa gi.

16. Ákwà-nb͕abá mara nma ka m'b͕abáworo n'ihe m'ji edina,Bú ákwà turu agwa nke ogho Ijipt.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ilu 7