11. I we sua udè n'ikpe-azu-gi,Mb͕e anu-aru-gi na aru-gi gāgwusi,
12. I we si, Le ka m'siworo kpọ idọ-aka-na-nti asì nke-uku,Ọ bu kwa iba-nba ka obim leliworo anya;
13. Egeghkwam nti n'olu ndi-ozizim,Ọ bughi kwa n'ebe ndi nēzím ihe nọ ka m'tọworo ntim n'ala!
14. Ọ fọduru ihe ntà ka m'nọzue n'ihe ọjọ nileN'etiti nkpọkọta na nzukọ ndi nkem.