17. N'ihi na ha eriwo nri nke nmebi-iwu,Ọ bu kwa manya nke ihe-ike ka ha nāṅu.
18. Ma okporo-uzọ ndi ezi omume di ka ìhè nēnwu enwu,Nke nāmu aga n'iru n'iru rue mb͕e chi bọchara.
19. Uzọ ndi nēmebi iwu di ka ọchichiri:Ha amaghi ihe ọ bu ha ji asu ngọngọ.
20. Nwam, ṅa nti n'okwum nile;Tọ nti-gi n'ala n'okwu-ọnum nile.
21. Ekwela ka ha si n'anya-gi abua wezuga onwe-ha;Debe ha n'etiti obi-gi.
22. N'ihi na ndu ka ha buru ndi nachọta ha,Ha bu kwa ihe nāgwọ anu-aru-ha nile.
23. Kari ihe-ndebe-gi nile chebe obi-gi;N'ihi na site na ya ka nputa nile nke ndu di.
24. Si n'ebe i nọ wezuga ọnu nēkwu ihe b͕agọrọ ab͕agọ,Me kwa ka eb͕ub͕ere-ọnu nke nēkwuhie ekwuhie di anya n'ebe i nọ.
25. Ka anya-gi abua legide n'iru,Ka mbubere-anya-gi lezi kwa n'iru gi.
26. Me ka okporo-uzọ nke ukwu-gi abua di lari,Ka edozi kwa uzọ-gi nile.