Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ilu 4:16-21 Bible Nso (IGBOB)

16. N'ihi na ha adighi-araru ura, ọ buru na ha adighi-eme ihe ọjọ;Anapuwo kwa ura-ha n'ike, ọ buru na ha adighi-eme ka madu su ngọngọ.

17. N'ihi na ha eriwo nri nke nmebi-iwu,Ọ bu kwa manya nke ihe-ike ka ha nāṅu.

18. Ma okporo-uzọ ndi ezi omume di ka ìhè nēnwu enwu,Nke nāmu aga n'iru n'iru rue mb͕e chi bọchara.

19. Uzọ ndi nēmebi iwu di ka ọchichiri:Ha amaghi ihe ọ bu ha ji asu ngọngọ.

20. Nwam, ṅa nti n'okwum nile;Tọ nti-gi n'ala n'okwu-ọnum nile.

21. Ekwela ka ha si n'anya-gi abua wezuga onwe-ha;Debe ha n'etiti obi-gi.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ilu 4