16. N'ihi na ha adighi-araru ura, ọ buru na ha adighi-eme ihe ọjọ;Anapuwo kwa ura-ha n'ike, ọ buru na ha adighi-eme ka madu su ngọngọ.
17. N'ihi na ha eriwo nri nke nmebi-iwu,Ọ bu kwa manya nke ihe-ike ka ha nāṅu.
18. Ma okporo-uzọ ndi ezi omume di ka ìhè nēnwu enwu,Nke nāmu aga n'iru n'iru rue mb͕e chi bọchara.
19. Uzọ ndi nēmebi iwu di ka ọchichiri:Ha amaghi ihe ọ bu ha ji asu ngọngọ.
20. Nwam, ṅa nti n'okwum nile;Tọ nti-gi n'ala n'okwu-ọnum nile.
21. Ekwela ka ha si n'anya-gi abua wezuga onwe-ha;Debe ha n'etiti obi-gi.