Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ilu 4:10-17 Bible Nso (IGBOB)

10. Nuru, nwam, nara kwa okwu-ọnum nile;Arọ ndu gāba-kwa-ra gi uba.

11. N'uzọ amam-ihe ka m'zíworo gi ihe;Emewom ka i zọ ije n'uzọ nile nke izi-ezi.

12. Mb͕e i nēje ije, agaghi-akpagide nzọ-ukwu-gi;Ọ buru kwa na i b͕a ọsọ, i gaghi-asu ngọngọ.

13. Jide idọ-aka-na-nti aka; arala ya aka:Chebe ya; n'ihi na ya onwe-ya bu ndu-gi.

14. Abàla n'okporo-uzọ ndi nēmebi iwu,Aga-kwa-la n'iru n'uzọ ndi ọjọ.

15. Zere ya, agabigala nime ya;Wezugara ya onwe-gi, gabiga.

16. N'ihi na ha adighi-araru ura, ọ buru na ha adighi-eme ihe ọjọ;Anapuwo kwa ura-ha n'ike, ọ buru na ha adighi-eme ka madu su ngọngọ.

17. N'ihi na ha eriwo nri nke nmebi-iwu,Ọ bu kwa manya nke ihe-ike ka ha nāṅu.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ilu 4