Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ilu 31:6-16 Bible Nso (IGBOB)

6. Nyenu onye nāla n'iyì ihe-ọṅuṅu nābà n'anya,Nye-kwa-nu ndi nkpuru-obi-ha di ilu manya-vine:

7. Ya ṅua, we chezọ ob͕eye ọ bu,Ghara kwa icheta ọnọdu ọjọ ya ọzọ.

8. Saghere onye-ob͕i ọnu-gi,N'okwu-ikpe nke ndi nile nāla n'iyì.

9. Saghe ọnu-gi, kpe ikpe n'ezi omume,Kpeputa kwa onye ewedara n'ala na ob͕eye.

10. Nwayi nke nējide onwe-ya nke-ọma, ònye gāchọputa ya?N'ihi na ọnu-ahia-ya kariri ruby nke-uku.

11. Obi di-ya atukwasiwo ya obi,Ọ dighi kwa ihe-nkwata nākọ nwoke ahu.

12. Nwayi ahu emesowo ya ezi ihe, ọ bughi kwa ihe ọjọ,Ubọchi nile nke ndu-ya.

13. Ọ chọwo aji-anu na flax,We nālu ọlu nātọ aka-ya abua utọ.

14. Ọ di ka ub͕ọ onye-ahia;Site n'ebe di anya ka ọ nēweta nri-ya.

15. O nēbili kwa mb͕e abali nādi kwa,We nye ulo-ya nri,Nye kwa umu-ab͕ọghọ-ya òkè-ha.

16. O zuwo izùzù ọhia, we nweta ya:Site n'ihe aka-ya abua lutara ka ọ kuworo ubi-vine.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ilu 31