Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ilu 31:1-13 Bible Nso (IGBOB)

1. Okwu Lemuel, bú eze; ibu eboro ya nke nne-ya ji dọ ya aka na nti.

2. Gini, nwam? gini kwa, nwa nke afọm?Gini kwa, nwa nke nkwa nile m'kwere?

3. Enyela ndinyom ike-gi,Enye-kwa-la ihe nēbibi ndi-eze uzọ-gi nile.

4. Ka ndi-eze ghara iṅu manya-vine, Lemuel, ka ndi-eze ghara iṅu manya-vine;Ka ndi-isi ghara kwa isi, Òle ebe ka ihe-ọṅuṅu nke nābà n'anya di?

5. Ka ha we ghara iṅu, we chezọ ukpuru atọrọ,We b͕anwe ikpé nke ndi nile ewedara n'ala.

6. Nyenu onye nāla n'iyì ihe-ọṅuṅu nābà n'anya,Nye-kwa-nu ndi nkpuru-obi-ha di ilu manya-vine:

7. Ya ṅua, we chezọ ob͕eye ọ bu,Ghara kwa icheta ọnọdu ọjọ ya ọzọ.

8. Saghere onye-ob͕i ọnu-gi,N'okwu-ikpe nke ndi nile nāla n'iyì.

9. Saghe ọnu-gi, kpe ikpe n'ezi omume,Kpeputa kwa onye ewedara n'ala na ob͕eye.

10. Nwayi nke nējide onwe-ya nke-ọma, ònye gāchọputa ya?N'ihi na ọnu-ahia-ya kariri ruby nke-uku.

11. Obi di-ya atukwasiwo ya obi,Ọ dighi kwa ihe-nkwata nākọ nwoke ahu.

12. Nwayi ahu emesowo ya ezi ihe, ọ bughi kwa ihe ọjọ,Ubọchi nile nke ndu-ya.

13. Ọ chọwo aji-anu na flax,We nālu ọlu nātọ aka-ya abua utọ.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ilu 31