Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ilu 3:21-35 Bible Nso (IGBOB)

21. Nwam, ekwela ka ha si n'anya-gi abua wezuga onwe-ha;Chebe nzube-ihe na ìzùzù;

22. Ha gābu-kwa-ra nkpuru-obi-gi ndu,Bu-kwa-ra olu-gi amara.

23. Mb͕e ahu ka i ganēje ije n'uzọ-gi na ntukwasi-obi,I gaghi-akpọbì kwa ukwu-gi,

24. Ọ buru na i dina ala, i gaghi-atu oké egwu:E, i gēdina ala, ura-gi gātọ kwa utọ.

25. Atula egwu site n'oké egwu mberede,Ma-ọbu site n'ikuku siri ike nke ndi nēmebi iwu, mb͕e ọ nābia:

26. N'ihi na Jehova gābu ntukwasi-obi-gi,Ọ gēdebe kwa ukwu-gi ka aghara ijide ya.

27. Eb͕ochila ezi ihe na ndi ọ diri,Mb͕e ọ diri ike aka-gi ime ya.

28. Asila madu-ibe-gi, Je, lata,Echi ka m'gēnye gi;Mb͕e ọ di n'aka-gi.

29. Echèputala ihe ọjọ megide madu-ibe-gi,Ebe onye ahu nēbi gi nso na ntukwasi-obi.

30. Gi na madu esela okwu n'efu,Ma ọ buru na o mesoghi gi ihe ọjọ.

31. Ekwosola onye neme ihe-ike ekworo,Arọputa-kwa-la otù efu n'uzọ-ya nile.

32. N'ihi na ihe-árú n'anya Jehova ka onye sihiere esihie bu:Ma n'aka ndi ziri ezi ka ìzù nzuzo Ya di.

33. Ọbubu-ọnu Jehova di n'ulo onye nēmebi iwu;Ma ebe-obibi ndi ezi omume ka Ọ nāgọzi.

34. Ọ buru na ọ bu ndi nākwa emò ka Ya onwe-ya nākwa emò,Ma ọ bu ndi di ume-ala n'obi ka Ọ nēnye amara.

35. Nsọpuru ka ndi mara ihe gēketa;Ma ndi-nzuzu nēbuli nlelì.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ilu 3