Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ilu 3:19-30 Bible Nso (IGBOB)

19. Jehova jiri amam-ihe tọ ntọ-ala uwa;O doziri elu-igwe site na nghọta.

20. Ejiri ihe-ọmuma-Ya kewa ob͕u-miri nile,Mbara-ígwé nile ji kwa ya atuda igirigi.

21. Nwam, ekwela ka ha si n'anya-gi abua wezuga onwe-ha;Chebe nzube-ihe na ìzùzù;

22. Ha gābu-kwa-ra nkpuru-obi-gi ndu,Bu-kwa-ra olu-gi amara.

23. Mb͕e ahu ka i ganēje ije n'uzọ-gi na ntukwasi-obi,I gaghi-akpọbì kwa ukwu-gi,

24. Ọ buru na i dina ala, i gaghi-atu oké egwu:E, i gēdina ala, ura-gi gātọ kwa utọ.

25. Atula egwu site n'oké egwu mberede,Ma-ọbu site n'ikuku siri ike nke ndi nēmebi iwu, mb͕e ọ nābia:

26. N'ihi na Jehova gābu ntukwasi-obi-gi,Ọ gēdebe kwa ukwu-gi ka aghara ijide ya.

27. Eb͕ochila ezi ihe na ndi ọ diri,Mb͕e ọ diri ike aka-gi ime ya.

28. Asila madu-ibe-gi, Je, lata,Echi ka m'gēnye gi;Mb͕e ọ di n'aka-gi.

29. Echèputala ihe ọjọ megide madu-ibe-gi,Ebe onye ahu nēbi gi nso na ntukwasi-obi.

30. Gi na madu esela okwu n'efu,Ma ọ buru na o mesoghi gi ihe ọjọ.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ilu 3