Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ilu 3:11-27 Bible Nso (IGBOB)

11. Nwam, ajula idọ-aka-na-nti nke Jehova:Ike agwu-kwa-la gi n'iba-nba-Ya:

12. N'ihi na onye Jehova nāhu n'anya ka Ọ nābara nba;Ọbuná dika nna si abara nwa-ya nke ihe-ya nātọ ya utọ nba.

13. Onye ihe nāgara nke-ọma ka madu nke chọtaworo amam-ihe bu,Ya na madu nke nēnweputa nghọta.

14. N'ihi na ọzuzú-ahia-ya di nma kari ọzuzú-ahia ọla-ọcha,Urù-ya di nma kari ọla-edo ọma.

15. Ihe di oké ọnu-ahia ka ọ bu kari ruby:Ihe nile kwa nke nātọ gi utọ, ha agaghi-ara ka ya.

16. Ubọchi ndu di ogologo di n'aka-nri-ya;N'aka-ekpe-ya ka àkù na nsọpuru di.

17. Uzọ-ya nile bu uzọ nke idi-utọ,Okporo-uzọ-ya nile bu kwa udo.

18. Osisi nēnye ndu ka ọ buru ndi nējide ya aka:E, onye ọ bula nke nējisi ya aka ike bu onye ihe nāgara nke-ọma.

19. Jehova jiri amam-ihe tọ ntọ-ala uwa;O doziri elu-igwe site na nghọta.

20. Ejiri ihe-ọmuma-Ya kewa ob͕u-miri nile,Mbara-ígwé nile ji kwa ya atuda igirigi.

21. Nwam, ekwela ka ha si n'anya-gi abua wezuga onwe-ha;Chebe nzube-ihe na ìzùzù;

22. Ha gābu-kwa-ra nkpuru-obi-gi ndu,Bu-kwa-ra olu-gi amara.

23. Mb͕e ahu ka i ganēje ije n'uzọ-gi na ntukwasi-obi,I gaghi-akpọbì kwa ukwu-gi,

24. Ọ buru na i dina ala, i gaghi-atu oké egwu:E, i gēdina ala, ura-gi gātọ kwa utọ.

25. Atula egwu site n'oké egwu mberede,Ma-ọbu site n'ikuku siri ike nke ndi nēmebi iwu, mb͕e ọ nābia:

26. N'ihi na Jehova gābu ntukwasi-obi-gi,Ọ gēdebe kwa ukwu-gi ka aghara ijide ya.

27. Eb͕ochila ezi ihe na ndi ọ diri,Mb͕e ọ diri ike aka-gi ime ya.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ilu 3