Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ilu 3:10-19 Bible Nso (IGBOB)

10. Ọba-gi nile gējuputa kwa n'ihe-nriju-afọ,Ebe-nzọcha-nkpuru-vine-gi nile gētiwa kwa na manya-vine ọhu.

11. Nwam, ajula idọ-aka-na-nti nke Jehova:Ike agwu-kwa-la gi n'iba-nba-Ya:

12. N'ihi na onye Jehova nāhu n'anya ka Ọ nābara nba;Ọbuná dika nna si abara nwa-ya nke ihe-ya nātọ ya utọ nba.

13. Onye ihe nāgara nke-ọma ka madu nke chọtaworo amam-ihe bu,Ya na madu nke nēnweputa nghọta.

14. N'ihi na ọzuzú-ahia-ya di nma kari ọzuzú-ahia ọla-ọcha,Urù-ya di nma kari ọla-edo ọma.

15. Ihe di oké ọnu-ahia ka ọ bu kari ruby:Ihe nile kwa nke nātọ gi utọ, ha agaghi-ara ka ya.

16. Ubọchi ndu di ogologo di n'aka-nri-ya;N'aka-ekpe-ya ka àkù na nsọpuru di.

17. Uzọ-ya nile bu uzọ nke idi-utọ,Okporo-uzọ-ya nile bu kwa udo.

18. Osisi nēnye ndu ka ọ buru ndi nējide ya aka:E, onye ọ bula nke nējisi ya aka ike bu onye ihe nāgara nke-ọma.

19. Jehova jiri amam-ihe tọ ntọ-ala uwa;O doziri elu-igwe site na nghọta.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ilu 3