Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ilu 3:1-11 Bible Nso (IGBOB)

1. Nwam, echezọla iwum;Ma ka obi-gi chebe ihe nile m'nyere n'iwu:

2. N'ihi na ubọchi ndu nke di ogologo, na ọtutu arọ nke ndu,Na udo, ka ha gātukwasiri gi.

3. Ekwela ka ebere na ezi-okwu rapu gi:Ke ha n'olu-gi;De ha n'elu mbadamba nkume, bú obi-gi:

4. Chọta kwa amara na ezi ucheN'anya Chineke na madu.

5. Tukwasi Jehova obi-gi nile,Adabere-kwa-la nghọta-gi:

6. N'uzọ-gi nile mara Ya,Ya onwe-ya gēme kwa ka okporo-uzọ-gi nile zie ezi.

7. Abula onye mara ihe n'anya gi onwe-gi;Tua egwu Jehova, we si n'ihe ọjọ wezuga onwe-gi:

8. Ya buru ihe nāgwọ otubo-gi,Ya buru kwa umi diri ọkpukpu-gi nile.

9. Sọpuru Jehova site n'àkù-gi,Site kwa na nkpuru mbu nke ihe-ọmume-gi nile:

10. Ọba-gi nile gējuputa kwa n'ihe-nriju-afọ,Ebe-nzọcha-nkpuru-vine-gi nile gētiwa kwa na manya-vine ọhu.

11. Nwam, ajula idọ-aka-na-nti nke Jehova:Ike agwu-kwa-la gi n'iba-nba-Ya:

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ilu 3