Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ilu 29:3-6 Bible Nso (IGBOB)

3. Onye ọ bula nke nāhu amam-ihe n'anya nēme ka nna-ya ṅuria:Ma onye bu eyì nke ndinyom nākwa iko nāla àkù-ya n'iyì.

4. Eze nēji ikpé ziri ezi eme ka ala-ya guzo:Ma onye nānara onyinye nākwada ya.

5. Nwoke nke nāgwa madu-ibe-ya okwu ire-utọNāb͕asara nzọ-ukwu-ya nile ub͕u.

6. Na njehie onye ọjọ ka ọnyà di:Ma onye ezi omume nēti nkpu ọṅù nāṅuri kwa.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ilu 29