Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ilu 29:11-23 Bible Nso (IGBOB)

11. Mọ nile nke onwe-ya ka onye-nzuzu nēme ka ọ puta ìhè:Ma onye mara ihe nēb͕ochi mọ-ya, nēme kwa ka ọ dajua.

12. Ọ buru na onye nāchi achi aṅa nti okwu-ugha,Ndi nile nējere ya ozi bu ndi nēmebi iwu.

13. Ob͕eye na onye-nmeb͕u ezutewo:Onye nēnye anya ha abua ìhè bu Jehova.

14. Eze nke nēkpe ndi nēnweghi ike ikpe n'ikwesi-ntukwasi-obi,Oche-eze-ya gēguzosi ike rue mb͕e ebighi-ebi.

15. Nkpa-n'aka na iba-nba nēnye amam-ihe:Ma nwata nke anārapu n'onwe-ya nēme ka ihere me nne-ya.

16. Mb͕e ndi nēmebi iwu nāba uba kari, njehie nāba kwa uba kari:Ma ndi ezi omume gēlekwasi ọdida-ha.

17. Dọ nwa-gi aka na nti, ọ gēme kwa ka i zu ike;E, ọ gēnye nkpuru-obi-gi ihe-utọ.

18. Mb͕e ọhù nādighi, ndi ala ahu adighi nchikọta:Ma onye nēdebe iwu, ihe nāgara onye ahu nke-ọma.

19. Ọ bughi okwu agēji dọ orù aka na nti:N'ihi na ọ bu ezie na ọ nāghọta, ma ọ̀ dighi ihe ọ nāza.

20. Ì huwo onye ọ bula nānukpọ onwe-ya n'okwu-ya nile?Olile-anya diri onye-nzuzu kari onye ahu.

21. Onye zutọworo orù-ya site na nwata,N'ikpe-azu-ya orù ahu gāghọ kwa nwa.

22. Onye-iwe nākpali ise-okwu,Ọzọ, onye nēnwe ọnuma ri nne nējehie ri nne.

23. Npako madu gēme ka ọ di ala:Ma onye mọ-ya di ala nējidesi nsọpuru ike.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ilu 29