1. Onye anābara nba ọtutu mb͕e ma ọ nēkwesi olu-ya ike,N'otù ntabi-anya ka agētipia ya, ọ dighi kwa ngwọta di.
2. Mb͕e ndi ezi omume nāba uba kari, ndi ala-ha nāṅuri:Ma mb͕e onye nēmebi iwu nāchi achi, ndi ala-ya nēze ume.
3. Onye ọ bula nke nāhu amam-ihe n'anya nēme ka nna-ya ṅuria:Ma onye bu eyì nke ndinyom nākwa iko nāla àkù-ya n'iyì.
4. Eze nēji ikpé ziri ezi eme ka ala-ya guzo:Ma onye nānara onyinye nākwada ya.
5. Nwoke nke nāgwa madu-ibe-ya okwu ire-utọNāb͕asara nzọ-ukwu-ya nile ub͕u.
6. Na njehie onye ọjọ ka ọnyà di:Ma onye ezi omume nēti nkpu ọṅù nāṅuri kwa.