Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ilu 28:21-24 Bible Nso (IGBOB)

21. Imata iru madu n'ikpé adighi nma:Ọ dighi kwa nma ka madu ji n'ihi iberibe nri nējehie.

22. Onye nāb͕aso àkù ka onye nwere anya ọjọ bu,Ma ọ maghi na ihe-ukọ gābiakute ya.

23. Onye nābara madu nba gēmesia huta amaraKari onye nēkwu ire-utọ.

24. Onye nānapu nna-ya ma-ọbu nne-ya ihe n'ike, si, Ọ dighi njehie ọ bu;Onye ejikọtaworo ya na onye-nbibi ka ọ bu.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ilu 28