19. Otú a ka onye ahu di nke ghọb͕uworo madu-ibe-ya,We si, Ọ̀ bughi egwú ka m'nēgwu?
20. Mb͕e nkú nādighi ọku gānyu:Otú a mb͕e ọ dighi onye nēkwu okwu-azu, ise-okwu gādaju.
21. Dika icheku si di n'ebe icheku nēre ọku di, na dika nkú si di n'ebe ọku di;Otú a ka onye nēse okwu di ime ka ilu-ọ̀gù nwuru ọku.
22. Okwu nile nke onye nēkwu okwu-azu di ka iberibe-nri di iche iche nātọ utọ nke-uku,Okwu ahu aridawo kwa n'ime-ime-ala afọ.
23. Ejùjù nke amachitaworo n'afuru-uzu ọla-ọchaKa eb͕ub͕ere-ọnu nke nēre ọku na obi ọjọ bu.
24. Eb͕ub͕ere-ọnu-ya abua ka onye nke nākpọ asì nēji buru onye-iru-abua,Ma nime onwe-ya ka ọ nētiye aghughọ:
25. Mb͕e olu-ya nēkwu amara, ekwela ya;N'ihi na ihe-árú asa di n'obi-ya.
26. Ọ bu ezie na ikpọ-asi-ya ji nrafu ekpuchi onwe-ya,Ma agēkpughe ihe ọjọ ya nime nkpọkọta ndi-ya.
27. Onye nēgwu olùlù, nime ya ka ọ gādabà:Ọzọ, onye nākpọre nkume, ya ka ọ gālaghachikuru.
28. Ire okwu-ugha nākpọ ndi o gwepiaworo asì;Ọzọ, ọnu nke nēkwu ire-utọ nākpata nnuda.