Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ilu 25:2-16 Bible Nso (IGBOB)

2. Ọ bu nsọpuru Chineke izobe okwu:Ma nsọpuru ndi-eze bu igwuputa ala okwu.

3. Elu-igwe n'idi-elu-ya, na ala n'omimi-ya,Na obi ndi-eze, ọ dighi ngwuputa di ha.

4. Wepu afuru-uzu n'ọla-ọcha,Ihe ewe putara onye nānucha ọla:

5. Wepu onye nēmebi iwu n'iru eze,Oche-eze-ya ewe guzosie ike n'ezi omume.

6. Asọpurula onwe-gi n'iru eze,Eguzo-kwa-la n'ọnọdu ndi uku:

7. N'ihi na ọ di nma ka asi gi, Rigota ebe a;Kari ka eme ka i di ala n'iru onye amara aha-ya,Onye anya-gi abua huworo.

8. Apula ngwa ngwa ise okwu,Ka o we ghara ibu na i maghi ihe i gēme n'ikpe-azu-ya,Mb͕e madu-ibe-gi etiyewo gi n'ọnọdu-ihere.

9. Gi na madu-ibe-gi kwurita okwu-ikpe-gi,Ekpughe-kwa-la izù nzuzo nke onye ọzọ:

10. Ka onye nke nānu ya we ghara ikwulu gi,Akukọ ihe ọjọ gi ewe ghara isi n'ebe i nọ laghachi.

11. Nkpuru-osisi apple ọla-edo nime nkata ọla-ọchaKa okwu ekwuru na mb͕e kwesiri ya bu.

12. Nb͕a-aka ọla-edo na ihe-ichọ-nma nke ọla-edo ọmaKa onye nāba nba nke mara ihe bu na nti nke nānu ihe.

13. Dika oyi snow n'ubọchi owuwe-ihe-ubi,Otú a ka ukọ̀ nke kwesiri ntukwasi-obi diri ndi nēziga ya;Ọ bu kwa nkpuru-obi ndi-nwe-ya ka ọ nēwelata.

14. Igwe-oji na ifufe nke miri-ozuzo nādighiKa onye nke nānya isi n'onyinye okwu-ugha bu.

15. Site n'eweghi iwe ọsọsọ ka anāràye onye-isi,Ire nrò nānyaji kwa ọkpukpu.

16. Ọ̀ bu manu-aṅu ka i chọtaworo? racha nke gēzuru gi;Ka i we ghara iriju ya afọ, we b͕ọ ya.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ilu 25