Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ilu 25:14-23 Bible Nso (IGBOB)

14. Igwe-oji na ifufe nke miri-ozuzo nādighiKa onye nke nānya isi n'onyinye okwu-ugha bu.

15. Site n'eweghi iwe ọsọsọ ka anāràye onye-isi,Ire nrò nānyaji kwa ọkpukpu.

16. Ọ̀ bu manu-aṅu ka i chọtaworo? racha nke gēzuru gi;Ka i we ghara iriju ya afọ, we b͕ọ ya.

17. Me ka ukwu-gi kọ ukọ n'ulo madu-ibe-gi;Ka ihe-gi we ghara iju ya afọ, o we kpọ gi asì.

18. Otùtù-agha na mma-agha na àkú di nkọKa onye nke nāb͕a àmà okwu-ugha megide madu-ibe-ya bu.

19. Ezé nyajiri anyaji na ukwu chikwa-puru echikwapuKa itukwasi onye-nghọb͕u obi n'ubọchi ahuhu bu.

20. Dika onye nēyipu uwe n'ubọchi oyi, dika manya b͕ara uka n'elu akanwu,Otú a ka onye nābùru obi jọrọ njọ abù di.

21. Ọ buru na agu nāgu onye nākpọ gi asì, gi me ka o rie nri;Ọ buru kwa na akpiri nākpọ ya nku, gi me ka ọ ṅua miri:

22. N'ihi na icheku nēre ọku ka i nāgukwasi n'isi-ya,Jehova gākwughachi kwa gi.

23. Ifufe Ugwu nāmuputa oké miri-ozuzo:Ọ bu kwa iru oké iwe ka iré nēkwu okwu-azu nāmuputa.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ilu 25