8. Iberibe-nri-gi nke i riworo ka i gāb͕ọputa,Okwu-gi nile nke di utọ ewe funari gi.
9. Ekwula okwu na nti onye-nzuzu;N'ihi na ọ gēleda ezi uche nke okwu-gi nile anya.
10. Ewezugala ókè-ala nke diworo mb͕e ebighi-ebi;Abà-kwa-la n'ọhia ọ bula nke umu-nb͕ei:
11. N'ihi na Onye-nb͕aputa-ha di ike;Ya onwe-ya gēkpe ọnu-ha megide gi.
12. Me ka obi-gi ba n'idọ-aka-na-nti,Me kwa ka nti-gi abua ba n'okwu-ọnu nile nke ihe-ọmuma.
13. Eb͕ochila idọ-aka-na-nti n'aru nwata:Mb͕e i gēji nkpa-n'aka tie ya, ọ gaghi-anwu.
14. Gi onwe-gi gēji nkpa-n'aka tie ya,We naputa nkpuru-obi-ya n'ala-mọ.
15. Nwam, ọ buru na obi-gi mara ihe,Obim gāṅuri, ọbuná nkem:
16. Akurum abua gāwuli kwa n'ọṅù,Mb͕e eb͕ub͕ere-ọnu-gi abua nēkwu ihe ziri ezi.
17. Ekwela ka obi-gi kwoso ndi-nmehie ekworo:Kama n'egwu Jehova ka i gānọ ogologo ubọchi nile.
18. N'ihi na ọdi-n'iru aghaghi idi;Agaghi-ebipu kwa olile-anya-gi.
19. Nuru, gi onwe-gi, nwam, we mara ihe,Me kwa ka obi-gi gazi agazi n'uzọ.
20. Anọla n'etiti ndi nāṅubiga manya-vine ókè;N'etiti ndi nēribiga anu ókè:
21. N'ihi na onye nāṅubiga manya ókè na onye nēribiga ihe ókè ka agānapu ihe nile:Ọ bu kwa nkirika ákwà ka òrù-ura gēyikwasi madu.
22. Ge nna-gi, bú onye muru gi, nti,Eleda-kwa-la nne-gi anya mb͕e o mere agadi.
23. Zuta ezi-okwu, ere-kwa-la ya;E, amam-ihe, na idọ-aka-na-nti, na nghọta.
24. Nna nke onye ezi omume gēteghari egwú ọṅù nke-uku:Onye nāmu kwa onye mara ihe gāṅuri ọṅu na ya.