1. Mb͕e i soro onye nāchi achi iri nri,Ghọta nke-ọma onye ahu nke nọ n'iru gi;
2. Tukwasi kwa mma n'akpiri-gi,Ma ọ buru na onye nri-ya nātọ ya utọ ka i bu.
3. Achọsila nri utọ ya ike;Ebe nri ahu bu nri okwu-ugha.
4. Adọb͕ula onwe-gi n'ọlu ibu ọgaranya;Site na nghọta-gi ra ya aka.
5. Ì gātukwasi anya-gi abua na ya? ọ dighi kwa:N'ihi na àkù nēmere onwe-ya nkù n'ezie, Dika ugo ka ọ nēfesi n'elu-igwe.
6. Erila nri nke onye nwere anya ọjọ,Achọsi-kwa-la nri utọ ya ike:
7. N'ihi na dika o si echè èchìchè na nkpuru-obi-ya, otú a ka ọ di:Rie ihe, ṅu kwa ihe-ọṅuṅu, ka ọ nāsi gi; Ma obi-ya adighi n'ebe i nọ.
8. Iberibe-nri-gi nke i riworo ka i gāb͕ọputa,Okwu-gi nile nke di utọ ewe funari gi.
9. Ekwula okwu na nti onye-nzuzu;N'ihi na ọ gēleda ezi uche nke okwu-gi nile anya.
10. Ewezugala ókè-ala nke diworo mb͕e ebighi-ebi;Abà-kwa-la n'ọhia ọ bula nke umu-nb͕ei:
11. N'ihi na Onye-nb͕aputa-ha di ike;Ya onwe-ya gēkpe ọnu-ha megide gi.
12. Me ka obi-gi ba n'idọ-aka-na-nti,Me kwa ka nti-gi abua ba n'okwu-ọnu nile nke ihe-ọmuma.