Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ilu 22:7-15 Bible Nso (IGBOB)

7. Ọgaranya nāchi ndi-ob͕eye,Ọzọ, orù ka onye nēbiri ego buru onye-nbinye.

8. Onye nāgha ajọ omume dika nkpuru gēwe ajọ ihe dika ihe-ubi:Nkpa-n'aka nke nrubiga ókè nke iwe-ya gāgwusi kwa.

9. Onye nwere anya ọma, onye ahu ka agāgọzi;N'ihi na o werewo nri-ya ufọdu nye onye nēnweghi ike.

10. Chupu onye nākwa emò, ise-okwu gāpu kwa;E, iru-uka na nlelì gākwusi.

11. Onye nāhu idi-ọcha nke obi n'anya,Eyì-ya ka eze gābu n'ihi amara nke eb͕ub͕ere-ọnu-ya abua.

12. Anya abua nke Jehova echebewo onye-ihe-ọmuma,Ma Ọ nēkpù okwu nile nke onye-nghọb͕u iru.

13. Onye-ume-ngwu asiwo, Ọdum di n'èzí:N'etiti amá ka agēb͕um.

14. Ọbù nke miri emi ka ọnu ndinyom nābughi nwunye-gi bu:Onye Jehova nēwesa oké iwe gādabà nime ya.

15. Uche b͕agọrọ ab͕agọ bu ihe ekekọtaworo n'obi nwata;Ma nkpa-n'aka nke idọ-aka-na-nti gēme ka ọ di anya n'ebe ọ nọ.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ilu 22