24. Gi na onye-iwe abula eyì;I gaghi-eso kwa onye-ọnuma ba n'ulo:
25. Ka i we ghara imuta uzọ-ya nile,We wetara nkpuru-obi-gi ọnyà.
26. Abula otù nime ndi gānara madu n'aka,Abu-kwa-la otù nime ndi nọ na mbe bayere ugwọ di iche iche.
27. Ọ buru na i nweghi ihe ikwu ugwọ,N'ìhi gini ka ọ gānapu ihe-ndina-gi n'okpuru gi?
28. Ewezugala ókè-ala nke diworo mb͕e ebighi-ebi,Nke nna-gi-hà kpaworo.
29. Ì huwo madu nke nēme ngwa n'ije-ozi-ya? n'iru ndi-eze ka o gēguzo onwe-ya;Ọ gaghi-eguzo onwe-ya n'iru ndi anāmaghi aha-ha.