Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ilu 22:15-21 Bible Nso (IGBOB)

15. Uche b͕agọrọ ab͕agọ bu ihe ekekọtaworo n'obi nwata;Ma nkpa-n'aka nke idọ-aka-na-nti gēme ka ọ di anya n'ebe ọ nọ.

16. Onye nēmeb͕u onye nēnweghi ike ime ka àkù nke aka ya ba uba,Ya na onye nēnye ọgaranya ihe gābiaru nání ihe-ukọ.

17. Tọ nti-gi n'ala, nu okwu nile nke ndi mara ihe,Tukwasi kwa obi-gi n'ihe-ọmumam.

18. N'ihi na ọ di utọ mb͕e i debe ha n'afọ-gi,Mb͕e ha gēguzosi ike n'otù n'elu eb͕ub͕ere-ọnu-gi abua.

19. Ọ bu ka ntukwasi-obi-gi we di na JehovaKa m'meworo ka i mara ha ta, ọbuná gi onwe-gi.

20. Èdetaghm i isi iheNime ndum-ọdu di iche iche na ihe-ọmuma;

21. Ime ka i mara ikwesi-ntukwasi-obi nke okwu-ọnu nile nke ezi-okwu,Ka i we weghachiri ndi nēzite gi okwu-ọnu nile nke bu ezi-okwu?

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ilu 22