Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ilu 22:13-26 Bible Nso (IGBOB)

13. Onye-ume-ngwu asiwo, Ọdum di n'èzí:N'etiti amá ka agēb͕um.

14. Ọbù nke miri emi ka ọnu ndinyom nābughi nwunye-gi bu:Onye Jehova nēwesa oké iwe gādabà nime ya.

15. Uche b͕agọrọ ab͕agọ bu ihe ekekọtaworo n'obi nwata;Ma nkpa-n'aka nke idọ-aka-na-nti gēme ka ọ di anya n'ebe ọ nọ.

16. Onye nēmeb͕u onye nēnweghi ike ime ka àkù nke aka ya ba uba,Ya na onye nēnye ọgaranya ihe gābiaru nání ihe-ukọ.

17. Tọ nti-gi n'ala, nu okwu nile nke ndi mara ihe,Tukwasi kwa obi-gi n'ihe-ọmumam.

18. N'ihi na ọ di utọ mb͕e i debe ha n'afọ-gi,Mb͕e ha gēguzosi ike n'otù n'elu eb͕ub͕ere-ọnu-gi abua.

19. Ọ bu ka ntukwasi-obi-gi we di na JehovaKa m'meworo ka i mara ha ta, ọbuná gi onwe-gi.

20. Èdetaghm i isi iheNime ndum-ọdu di iche iche na ihe-ọmuma;

21. Ime ka i mara ikwesi-ntukwasi-obi nke okwu-ọnu nile nke ezi-okwu,Ka i we weghachiri ndi nēzite gi okwu-ọnu nile nke bu ezi-okwu?

22. Anapula onye nēnweghi ike ihe n'ike, n'ihi na onye nēnweghi ike ka ọ bu,Azọpia-kwa-la onye ewedara n'ala n'ọnu-uzọ-ama:

23. N'ihi na Jehova gēkpe ọnu-ha,We punara ndi ahu ndu, bú ndi nāpunara ha ihe.

24. Gi na onye-iwe abula eyì;I gaghi-eso kwa onye-ọnuma ba n'ulo:

25. Ka i we ghara imuta uzọ-ya nile,We wetara nkpuru-obi-gi ọnyà.

26. Abula otù nime ndi gānara madu n'aka,Abu-kwa-la otù nime ndi nọ na mbe bayere ugwọ di iche iche.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ilu 22