Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ilu 20:2-15 Bible Nso (IGBOB)

2. Ọb͕ub͕ọ-uja dika nke ọdum ka oké ujọ anātu eze bu:Onye nākpasu Ya iwe nke nērubiga ókè nēmehie megide ndu nke aka ya.

3. Ọ buru madu nsọpuru ikwusi ilu ọ̀gù:Ma onye ọ bula nke uche-ya b͕agọrọ ab͕agọ ganālusi ọ̀gù ike.

4. N'ihi na ọ bu mb͕e oyi nātu, onye-ume-ngwu agaghi-alu ọlu ubi;Ọ gāriọ aririọ na mb͕e owuwe-ihe-ubi, ọ dighi kwa ihe ọ gēnwe.

5. Miri nke miri emi ka ndum-ọdu n'obi madu bu;Ma onye-nghọta gādọputa ya.

6. Ọtutu madu nākpọsa, onye ọ bula ebere nke aka ya:Ma onye kwesiri ntukwasi-obi, ònye gāchọputa ya?

7. Onye ezi omume nke nējeghari n'izu-okè-ya,Ndi ihe nāgara nke-ọma ka umu-ya nke gānọchi ya gābu.

8. Eze nke nānọkwasi n'oche ikpéJi anya-ya abua afuchapu ihe ọjọ nile.

9. Ònye gāsi, Emewom ka obim di ọcha,Aghọwom onye di ọcha pua na nmehiem?

10. Uzọ nkume-isì-ihe abua, na uzọ ephah abua,Ihe-árú n'anya Jehova ka ha abua bu n'otù.

11. Ọbuná nwata nēme ka amata ya site n'omume-ya nile,Ma ọlu-ya di ọcha, ma o zi-kwa-ra ezi.

12. Nti nke nānu ihe, na anya nke nāhu uzọ,Jehova emewo ọbuná ha abua.

13. Ahula urá n'anya, ka ewe ghara inapu gi ihe nile;Meghe anya-gi abua, rijue nri afọ.

14. Ọ jọrọ njọ, ọ jọrọ njọ, ka onye nāzù azù nāsi:Ma mb͕e ọ laworo n'ulo-ya, mb͕e ahu ka ọ nānya isi.

15. Ọla-edo di, na ọtutu ruby:Ma ihe di oké ọnu-ahia ka eb͕ub͕ere-ọnu nke nēkwu ihe-ọmuma bu.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ilu 20