Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ilu 2:3-12 Bible Nso (IGBOB)

3. E, ọ buru na ọ bu nmata ka i nākpọku,Ọ buru kwa na ọ bu nghọta ka i nēweliri olu-gi;

4. Ọ buru na i chọ ya dika ọla-ọcha,Ọ buru kwa na ọ bu dika àkù zoro ezo ka i nēgwuputa ya:

5. Mb͕e ahu ka i gāghọta egwu Jehova,Ọ bu kwa ihe-ọmuma Chineke ka i gāchọta.

6. N'ihi na Jehova nēnye amam-ihe;N'ọnu-Ya ka ihe-ọmuma na nghọta si aputa:

7. O nēzobere ndi ziri ezi nzube-ihe,Ọ bu ọta ndi nēje ije n'izu-okè nwere;

8. Iche okporo-uzọ nile nke ikpé,Ọ bu kwa uzọ ndi-ebere-Ya ka Ọ nēdebe.

9. Mb͕e ahu ka i gāghọta ezi omume na ikpé,Na izi-ezi nile, e, ezi uzọ ọ bula.

10. N'ihi na amam-ihe gābà n'obi-gi,Ihe-ọmuma gādi kwa nkpuru-obì-gi utọ;

11. Ìzùzù ganēche gi nche,Nghọta gēchebe gi:

12. Inaputa gi n'uzọ onye ọjọ,N'aka madu nēkwu okwu ib͕akuta Chineke azu;

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ilu 2