16. Inaputa gi n'aka nwayi nābughi nwunye-gi,N'aka nwayi nābughi nwunye-gi nke nēkwu okwu ire-utọ;
17. Nke nārapu di o nwere n'ab͕ọghọ,Ọb͕ub͕a-ndu nke Chineke-ya kwa, o chezọwo ya:
18. N'ihi na uzọ iridaru ọnwu ka ulo-ya bu,Ọ bu kwa uzọ iridaru n'ebe ndi nādighi ndu nọ ka uzọ-ya nile bu.