14. Ndi nāṅuri ime ihe ọjọ,Ha nēteghari egwú ọṅù n'ib͕akuta Chineke azu nke onye ọjọ;
15. Ndi okporo-uzọ nile ha b͕agọrọ ab͕agọ,Ha nēsihie kwa n'uzọ nile ha:
16. Inaputa gi n'aka nwayi nābughi nwunye-gi,N'aka nwayi nābughi nwunye-gi nke nēkwu okwu ire-utọ;
17. Nke nārapu di o nwere n'ab͕ọghọ,Ọb͕ub͕a-ndu nke Chineke-ya kwa, o chezọwo ya:
18. N'ihi na uzọ iridaru ọnwu ka ulo-ya bu,Ọ bu kwa uzọ iridaru n'ebe ndi nādighi ndu nọ ka uzọ-ya nile bu.
19. Ndi nile ndi nābakuru ya, ha adighi-alata,Ha adighi-eru kwa okporo-uzọ nile nke ndu:
20. Ka i we je ije n'uzọ ndi di nma,Debe kwa okporo-uzọ nile nke ndi ezi omume.
21. N'ihi na ndi ziri ezi gēbi n'uwa,Ndi zuru okè gāfọdu kwa nime ya.