1. Nwam, ọ buru na i nara okwu-ọnum nile,Ọ buru kwa na i zobe ihe nile m'nyere n'iwu n'ebe i nọ;
2. Itọrọ amam-ihe nti-gi n'ala,We wezuga obi-gi inwe nghọta;
3. E, ọ buru na ọ bu nmata ka i nākpọku,Ọ buru kwa na ọ bu nghọta ka i nēweliri olu-gi;
4. Ọ buru na i chọ ya dika ọla-ọcha,Ọ buru kwa na ọ bu dika àkù zoro ezo ka i nēgwuputa ya:
5. Mb͕e ahu ka i gāghọta egwu Jehova,Ọ bu kwa ihe-ọmuma Chineke ka i gāchọta.
6. N'ihi na Jehova nēnye amam-ihe;N'ọnu-Ya ka ihe-ọmuma na nghọta si aputa:
7. O nēzobere ndi ziri ezi nzube-ihe,Ọ bu ọta ndi nēje ije n'izu-okè nwere;
8. Iche okporo-uzọ nile nke ikpé,Ọ bu kwa uzọ ndi-ebere-Ya ka Ọ nēdebe.
9. Mb͕e ahu ka i gāghọta ezi omume na ikpé,Na izi-ezi nile, e, ezi uzọ ọ bula.
10. N'ihi na amam-ihe gābà n'obi-gi,Ihe-ọmuma gādi kwa nkpuru-obì-gi utọ;