Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ilu 17:8-18 Bible Nso (IGBOB)

8. Nkume amara ka iri-ngo bu n'anya ndi-nwe-ya:Ebe ọ bula ọ nēche iru ọ nāgara ya.

9. Onye nēkpuchi njehie nāchọ ihu-n'anya:Ma onye nēkwu okwu mb͕e na mb͕e nēkewa ezi eyì.

10. Ibasi-nba-ike nābàmi nime onye-nghọtaKari ka ọgu otiti ise gābà nime onye-nzuzu.

11. Nání nnupu-isi ka onye ọjọ nāchọ;Ọ bu kwa onye-ozi nēnweghi obi-ebere ka agēziga megide ya.

12. Ka nne-bear nke b͕ara aka umu-ya zute madu,Kari onye-nzuzu n'uche-ya b͕agọrọ ab͕agọ.

13. Onye nēnyeghachi ihe ọjọ n'ọnọdu ezi ihe,Ihe ọjọ agaghi-apu n'ulo-ya.

14. Dika mb͕e madu nērùpu miri, otú a ka isi-nmalite ise-okwu di:N'ihi ya tutu ilu-ọ̀gù esie ike rapu ya.

15. Onye nāgu onye nēmebi iwu n'onye ezi omume, na onye nāma onye ezi omume ikpe,Ihe-árú n'anya Jehova ka ha abua bu n'otù.

16. N'ìhi gini kwa ka ego-ọzùzù-ahia di n'aka onye-nzuzu izuta amam-ihe,Mb͕e obi amam-ihe nādighi?

17. Na mb͕e nile ka eyì nāhu n'anya,Anāmu kwa-nwa-nne bayere ahuhu.

18. Madu nke obi amam-ihe kọrọ nānara madu n'aka ibu onye-mbe,Ọ nāghọ onye nọ na mbe n'iru madu-ibe-ya.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ilu 17