Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ilu 17:5-13 Bible Nso (IGBOB)

5. Onye nākwa ob͕eye emò atawo Onye meworo ya uta:Onye nāṅuri ọṅu bayere nhuju-anya ndi ọzọ, agaghi-agu ya n'onye nēmeghi ihe ọjọ.

6. Okpu-eze ndi-okenye ka umu umu bu;Ọzọ, ima-nma nke umu bu nna-ha.

7. Ọ maghi nma n'ebe onye-nzuzu nọ, bú eb͕ub͕ere-ọnu nēkwu ihe makarisiri nma:Èb͕ub͕ere-ọnu nke nēkwu okwu-ugha gēsi kwa aṅa ma nma n'ebe onye amara aha-ya nọ?

8. Nkume amara ka iri-ngo bu n'anya ndi-nwe-ya:Ebe ọ bula ọ nēche iru ọ nāgara ya.

9. Onye nēkpuchi njehie nāchọ ihu-n'anya:Ma onye nēkwu okwu mb͕e na mb͕e nēkewa ezi eyì.

10. Ibasi-nba-ike nābàmi nime onye-nghọtaKari ka ọgu otiti ise gābà nime onye-nzuzu.

11. Nání nnupu-isi ka onye ọjọ nāchọ;Ọ bu kwa onye-ozi nēnweghi obi-ebere ka agēziga megide ya.

12. Ka nne-bear nke b͕ara aka umu-ya zute madu,Kari onye-nzuzu n'uche-ya b͕agọrọ ab͕agọ.

13. Onye nēnyeghachi ihe ọjọ n'ọnọdu ezi ihe,Ihe ọjọ agaghi-apu n'ulo-ya.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ilu 17