Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ilu 17:22-28 Bible Nso (IGBOB)

22. Obi nke nāṅuri ọṅu nēme ka aru di nma:Ma mọ madu nke etib͕uru etib͕u nāmikọ ọkpukpu.

23. Ihe-iri-ngo ka onye nēmebi iwu nēweputa n'uwe-obi-ya,Iwezuga uzọ nile nke ikpé.

24. N'iru onye-nghọta ka amam-ihe di:Ma anya abua nke onye-nzuzu di na nsọtu uwa.

25. Ihe nākpasu nna-ya iwe ka nwa nzuzu bu,Ọ bu-kwa-ra nwanyi muru ya ihe-ilu.

26. Ọzọ, iri onye ezi omume nra adighi nma,Ọ dighi kwa nma itib͕u ndi amara aha-ha n'ihi izi-ezi-ha.

27. Onye nēb͕ochi okwu-ọnu-ya mara ihe-ọmuma:Ọzọ, onye mọ-ya juru ajuru bu onye-nghọta.

28. Ọbuná onye uche-ya b͕agọrọ ab͕agọ, mb͕e ọ nāb͕a, anāgu ya n'onye mara ihe:Onye nēkpuchi eb͕ub͕ere-ọnu-ya abua bu onye-nghọta.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ilu 17