12. Ka nne-bear nke b͕ara aka umu-ya zute madu,Kari onye-nzuzu n'uche-ya b͕agọrọ ab͕agọ.
13. Onye nēnyeghachi ihe ọjọ n'ọnọdu ezi ihe,Ihe ọjọ agaghi-apu n'ulo-ya.
14. Dika mb͕e madu nērùpu miri, otú a ka isi-nmalite ise-okwu di:N'ihi ya tutu ilu-ọ̀gù esie ike rapu ya.
15. Onye nāgu onye nēmebi iwu n'onye ezi omume, na onye nāma onye ezi omume ikpe,Ihe-árú n'anya Jehova ka ha abua bu n'otù.
16. N'ìhi gini kwa ka ego-ọzùzù-ahia di n'aka onye-nzuzu izuta amam-ihe,Mb͕e obi amam-ihe nādighi?
17. Na mb͕e nile ka eyì nāhu n'anya,Anāmu kwa-nwa-nne bayere ahuhu.
18. Madu nke obi amam-ihe kọrọ nānara madu n'aka ibu onye-mbe,Ọ nāghọ onye nọ na mbe n'iru madu-ibe-ya.
19. Onye nāhu njehie n'anya nāhu ilu-ọ̀gù n'anya:Onye nēme ka ọnu-uzọ-ya di elu nāchọ ntipia.
20. Onye obi-ya b͕agọrọ ab͕agọ adighi-achọta ezi ihe:Ọzọ, onye nāb͕anwe onwe-ya n'ire-ya gādabà n'ihe ọjọ.
21. Onye nāmu onye-nzuzu ọ gāburu ya iru-újú:Nna onye-nzuzu adighi-aṅuri kwa ọṅu.
22. Obi nke nāṅuri ọṅu nēme ka aru di nma:Ma mọ madu nke etib͕uru etib͕u nāmikọ ọkpukpu.
23. Ihe-iri-ngo ka onye nēmebi iwu nēweputa n'uwe-obi-ya,Iwezuga uzọ nile nke ikpé.
24. N'iru onye-nghọta ka amam-ihe di:Ma anya abua nke onye-nzuzu di na nsọtu uwa.