Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ilu 17:1-17 Bible Nso (IGBOB)

1. Ọ di nma iri iberibe achicha kpọrọ nku, ma inọ-n'udo adi ya,Kari ulo juputara n'àjà anēri nālu ọ̀gù.

2. Orù nke nwere uche gāchi nwa madu nēweta ihere,Ọ bu kwa n'etiti umu-nne nwa ahu ka ọ gēkere ihe-nketa.

3. Ite eji anucha ihe diri ọla-ọcha, oké ọku di-kwa-ra ọla-edo:Ma Onye nānwa obi bu Jehova.

4. Onye nēme ihe ọjọ nātọ nti n'ala n'eb͕ub͕ere-ọnu nēkwu ajọ ihe;Onye-okwu-ugha nāṅa nti ire nēkwu ihe-ila-n'iyì.

5. Onye nākwa ob͕eye emò atawo Onye meworo ya uta:Onye nāṅuri ọṅu bayere nhuju-anya ndi ọzọ, agaghi-agu ya n'onye nēmeghi ihe ọjọ.

6. Okpu-eze ndi-okenye ka umu umu bu;Ọzọ, ima-nma nke umu bu nna-ha.

7. Ọ maghi nma n'ebe onye-nzuzu nọ, bú eb͕ub͕ere-ọnu nēkwu ihe makarisiri nma:Èb͕ub͕ere-ọnu nke nēkwu okwu-ugha gēsi kwa aṅa ma nma n'ebe onye amara aha-ya nọ?

8. Nkume amara ka iri-ngo bu n'anya ndi-nwe-ya:Ebe ọ bula ọ nēche iru ọ nāgara ya.

9. Onye nēkpuchi njehie nāchọ ihu-n'anya:Ma onye nēkwu okwu mb͕e na mb͕e nēkewa ezi eyì.

10. Ibasi-nba-ike nābàmi nime onye-nghọtaKari ka ọgu otiti ise gābà nime onye-nzuzu.

11. Nání nnupu-isi ka onye ọjọ nāchọ;Ọ bu kwa onye-ozi nēnweghi obi-ebere ka agēziga megide ya.

12. Ka nne-bear nke b͕ara aka umu-ya zute madu,Kari onye-nzuzu n'uche-ya b͕agọrọ ab͕agọ.

13. Onye nēnyeghachi ihe ọjọ n'ọnọdu ezi ihe,Ihe ọjọ agaghi-apu n'ulo-ya.

14. Dika mb͕e madu nērùpu miri, otú a ka isi-nmalite ise-okwu di:N'ihi ya tutu ilu-ọ̀gù esie ike rapu ya.

15. Onye nāgu onye nēmebi iwu n'onye ezi omume, na onye nāma onye ezi omume ikpe,Ihe-árú n'anya Jehova ka ha abua bu n'otù.

16. N'ìhi gini kwa ka ego-ọzùzù-ahia di n'aka onye-nzuzu izuta amam-ihe,Mb͕e obi amam-ihe nādighi?

17. Na mb͕e nile ka eyì nāhu n'anya,Anāmu kwa-nwa-nne bayere ahuhu.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ilu 17