11. Ihe-ọtùtù na ihe-osìsì ziri ezi diri Jehova:Ọlu-Ya ka nkume-osìsì nile nke akpa bu.
12. Ọ buru ndi-eze ihe-árú ime nmebi-iwu:N'ihi na ezi omume ka oche-eze ji eguzosi ike.
13. Ihe nātọ ndi-eze utọ ka eb͕ub͕ere-ọnu ezi omume bu;Ọ bu kwa onye nēkwu ihe ziri ezi ka ha nāhu n'anya.
14. Ọnuma eze bu ndi-ozi ọnwu:Ma onye mara ihe gēkpuchi ya.