6. Onye nākwa emò achọwo amam-ihe, ma ọ hughi ya:Ma ihe-ọmuma diri onye-nghọta nfe.
7. Je na ncherita-iru onye-nzuzu,I gaghi-amata kwa eb͕ub͕ere-ọnu ihe-ọmuma n'aru ya.
8. Amam-ihe onye nwere ezi uche bu ighọta uzọ-ya:Ma uche b͕agọrọ ab͕agọ nke ndi-nzuzu bu aghughọ.
9. Ndi b͕agọrọ ab͕agọ n'uche-ha, ikpe-ọmuma nākwa emò ha:Ma n'etiti ndi ziri ezi ka ihe nātọ Chineke utọ di.
10. Obi mara ilu nke aka ya;Ọ bu kwa n'ọṅù-ya ka onye nke nābughi nke ya nādighi-agwakọta onwe-ya.
11. Ulo nke ndi nēmebi iwu, agēme ka ọ tọb͕orọ n'efu:Ma ulo-ikwū nke ndi ziri ezi gāma akwukwọ dika ihe akuku aku.
12. Uzọ di nke ziri ezi n'iru madu,Ma nsọtu-ya bu uzọ nile nke ọnwu.
13. Ọbuná n'ọchì ka ihe nēb͕u obi nb͕u;Ọzọ, ikpe-azu ọṅù bu iru-újú.
14. Site n'uzọ nile nke aka ya ka afọ gēju onye laghachiworo azu n'obi:Ma ọ bu site n'onwe-ya ka afọ gēju ezi madu.
15. Onye nēnweghi uche nēkwere okwu nile ọ bula:Ma onye nwere ezi uche nāghọta ije-ukwu-ya.
16. Onye mara ihe nātu egwu, we si n'ihe ọjọ wezuga onwe-ya:Ma onye-nzuzu nēwebiga iwe ókè, we nātukwasi obi.
17. Onye nēwe iwe ọsọsọ gēme ihe nke uche b͕agọrọ ab͕agọ:Ọzọ, onye ọbula nke nēzu nzube ọjọ di iche iche, anākpọ ya asì.
18. Ndi nēnweghi uche eketawo uche b͕agọrọ ab͕agọ:Ma ndi nwere ezi uche ka anēkpube ihe-ọmuma n'isi.
19. Ndi ọjọ erudawo ala n'iru ndi ezi madu;Ndi nēmebi iwu kwa n'ọnu-uzọ-ama nile nke onye ezi omume.
20. Ọbuná onye-ab͕ata-obi nke ob͕eye nākpọ ya asì:Ma ndi nāhu ọgaranya n'anya di ọtutu.
21. Onye nēleda madu-ibe-ya anya nēmehie:Ma onye nēmere ndi ewedara n'ala amara, onye ihe nāgara nke-ọma ka ọ bu.
22. Hà adighi-akpafu, bú ndi nēchèputa ihe ọjọ?Ma ebere na ezi-okwu gādiri ndi nēchèputa ezi ihe.