2. Onye nēje ije n'izi-ezi-ya nātu egwu Jehova:Ma onye nēsihie n'uzọ-ya nile nēleda Ya anya.
3. N'ọnu onye b͕agọrọ ab͕agọ n'uche-ya ka ome npako di:Ma eb͕ub͕ere-ọnu nke ndi mara ihe gēdebe ha.
4. Mb͕e ehi nādighi, ulo anāzù ehi nādi ọcha:Ma ihe-omume riri nne nēsite n'ike ehi.
5. Onye-àmà nke kwesiri ntukwasi-obi adighi-ekwu okwu-ugha:Ma onye-àmà okwu-ugha nēkupu okwu-ugha dika ume.
6. Onye nākwa emò achọwo amam-ihe, ma ọ hughi ya:Ma ihe-ọmuma diri onye-nghọta nfe.
7. Je na ncherita-iru onye-nzuzu,I gaghi-amata kwa eb͕ub͕ere-ọnu ihe-ọmuma n'aru ya.
8. Amam-ihe onye nwere ezi uche bu ighọta uzọ-ya:Ma uche b͕agọrọ ab͕agọ nke ndi-nzuzu bu aghughọ.