Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ilu 14:13-29 Bible Nso (IGBOB)

13. Ọbuná n'ọchì ka ihe nēb͕u obi nb͕u;Ọzọ, ikpe-azu ọṅù bu iru-újú.

14. Site n'uzọ nile nke aka ya ka afọ gēju onye laghachiworo azu n'obi:Ma ọ bu site n'onwe-ya ka afọ gēju ezi madu.

15. Onye nēnweghi uche nēkwere okwu nile ọ bula:Ma onye nwere ezi uche nāghọta ije-ukwu-ya.

16. Onye mara ihe nātu egwu, we si n'ihe ọjọ wezuga onwe-ya:Ma onye-nzuzu nēwebiga iwe ókè, we nātukwasi obi.

17. Onye nēwe iwe ọsọsọ gēme ihe nke uche b͕agọrọ ab͕agọ:Ọzọ, onye ọbula nke nēzu nzube ọjọ di iche iche, anākpọ ya asì.

18. Ndi nēnweghi uche eketawo uche b͕agọrọ ab͕agọ:Ma ndi nwere ezi uche ka anēkpube ihe-ọmuma n'isi.

19. Ndi ọjọ erudawo ala n'iru ndi ezi madu;Ndi nēmebi iwu kwa n'ọnu-uzọ-ama nile nke onye ezi omume.

20. Ọbuná onye-ab͕ata-obi nke ob͕eye nākpọ ya asì:Ma ndi nāhu ọgaranya n'anya di ọtutu.

21. Onye nēleda madu-ibe-ya anya nēmehie:Ma onye nēmere ndi ewedara n'ala amara, onye ihe nāgara nke-ọma ka ọ bu.

22. Hà adighi-akpafu, bú ndi nēchèputa ihe ọjọ?Ma ebere na ezi-okwu gādiri ndi nēchèputa ezi ihe.

23. Na ndọb͕u nile nke madu nādọb͕u onwe-ya n'ọlu urù di ya:Ma okwu eb͕ub͕ere-ọnu nēdubà nání n'ihe-ikọ-ukọ.

24. Okpu-eze nke ndi mara ihe bu àkù-ha:Ma uche b͕agọrọ ab͕agọ nke ndi-nzuzu bu nání uche b͕agọrọ ab͕agọ.

25. Onye nānaputa nkpuru-obi di iche iche ka onye-àmà nke nēkwu ezi-okwu bu:Ma onye nēkupu ọtutu okwu-ugha dika ume nāghọ aghughọ.

26. N'egwu Jehova ka ntukwasi-obi siri ike di:Umu-Ya gēnwe kwa ebe-nb͕abà.

27. Egwu Jehova bu isi-iyi nke ndu,Isi n'ọnyà nile nke ọnwu wezuga onwe-gi.

28. N'uba nke ndi ọ bula ka ima-nma eze di:Ma n'ukọ mba ọ bula ka nbibi onye-isi di.

29. Onye nādighi-ewe iwe ọsọsọ nwere ọtutu nghọta:Ma onye nwere obi ọku nēbuli uche b͕agọrọ ab͕agọ.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ilu 14