Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ilu 14:1-11 Bible Nso (IGBOB)

1. Nwanyi ọ bula nke mara ihe ewuwo ulo-ya:Ma nwanyi nke b͕agọrọ ab͕agọ n'uche-ya ji aka-ya abua akwada ya.

2. Onye nēje ije n'izi-ezi-ya nātu egwu Jehova:Ma onye nēsihie n'uzọ-ya nile nēleda Ya anya.

3. N'ọnu onye b͕agọrọ ab͕agọ n'uche-ya ka ome npako di:Ma eb͕ub͕ere-ọnu nke ndi mara ihe gēdebe ha.

4. Mb͕e ehi nādighi, ulo anāzù ehi nādi ọcha:Ma ihe-omume riri nne nēsite n'ike ehi.

5. Onye-àmà nke kwesiri ntukwasi-obi adighi-ekwu okwu-ugha:Ma onye-àmà okwu-ugha nēkupu okwu-ugha dika ume.

6. Onye nākwa emò achọwo amam-ihe, ma ọ hughi ya:Ma ihe-ọmuma diri onye-nghọta nfe.

7. Je na ncherita-iru onye-nzuzu,I gaghi-amata kwa eb͕ub͕ere-ọnu ihe-ọmuma n'aru ya.

8. Amam-ihe onye nwere ezi uche bu ighọta uzọ-ya:Ma uche b͕agọrọ ab͕agọ nke ndi-nzuzu bu aghughọ.

9. Ndi b͕agọrọ ab͕agọ n'uche-ha, ikpe-ọmuma nākwa emò ha:Ma n'etiti ndi ziri ezi ka ihe nātọ Chineke utọ di.

10. Obi mara ilu nke aka ya;Ọ bu kwa n'ọṅù-ya ka onye nke nābughi nke ya nādighi-agwakọta onwe-ya.

11. Ulo nke ndi nēmebi iwu, agēme ka ọ tọb͕orọ n'efu:Ma ulo-ikwū nke ndi ziri ezi gāma akwukwọ dika ihe akuku aku.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ilu 14