9. Ọ di nma, bú onye anēlelì, ma o nwere orù,Kari onye nāsọpuru onwe-ya, ma nri kọrọ ya.
10. Onye ezi omume mara ndu anu-ulo-ya:Ma obi-ebere nile nke ndi nēmebi iwu bu enweghi-obi-ebere.
11. Onye nālu ala-ubi-ya, afọ gēju ya na nri:Ma onye nāb͕aso ihe-efu di iche iche, obi amam-ihe kọrọ ya.
12. Onye nēmebi iwu achọsiwo ọnyà ndi ọjọ ike:Ma nkpọrọgwu ndi ezi omume nāmi nkpuru.
13. Na njehie nke eb͕ub͕ere-ọnu ka ọnyà onye ọjọ di:Ma onye ezi omume gēsi n'ahuhu puta.
14. Site na nkpuru nke ọnu onwe-ya ka afọ gēju onye ọ bula n'ezi ihe:Ọzọ, nmeso aka madu nke ọ nēmeso madu-ibe-ya, nke ahu ka agēnyeghachi ya.
15. Uzọ nke onye b͕agọrọ ab͕agọ n'uche-ya ziri ezi n'anya ya onwe-ya:Ma onye nēge nti ndum-ọdu ka onye mara ihe bu.
16. Onye b͕agọrọ ab͕agọ n'uche-ya, n'otù ubọchi ahu ka anāmara iwe anākpasu ya:Ma onye nēkpuchi nlelì ka onye nwere ezi uche bu.
17. Onye nēkupu ikwesi-ntukwasi-obi dika ume nēgosi ezi omume,Ma onye-àmà okwu-ugha nēgosi aghughọ.
18. O nwere onye nēkwu okwu nēchèghi echè dika ndupú nke mma-agha:Ma ire ndi mara ihe bu ihe nāgwọ madu.
19. Eb͕ub͕ere-ọnu ezi-okwu gēguzosi ike rue mb͕e ebighi-ebi:Ma nání rue otù ntabi-anya ka ire okwu-ugha di.