12. Onye nēmebi iwu achọsiwo ọnyà ndi ọjọ ike:Ma nkpọrọgwu ndi ezi omume nāmi nkpuru.
13. Na njehie nke eb͕ub͕ere-ọnu ka ọnyà onye ọjọ di:Ma onye ezi omume gēsi n'ahuhu puta.
14. Site na nkpuru nke ọnu onwe-ya ka afọ gēju onye ọ bula n'ezi ihe:Ọzọ, nmeso aka madu nke ọ nēmeso madu-ibe-ya, nke ahu ka agēnyeghachi ya.
15. Uzọ nke onye b͕agọrọ ab͕agọ n'uche-ya ziri ezi n'anya ya onwe-ya:Ma onye nēge nti ndum-ọdu ka onye mara ihe bu.
16. Onye b͕agọrọ ab͕agọ n'uche-ya, n'otù ubọchi ahu ka anāmara iwe anākpasu ya:Ma onye nēkpuchi nlelì ka onye nwere ezi uche bu.
17. Onye nēkupu ikwesi-ntukwasi-obi dika ume nēgosi ezi omume,Ma onye-àmà okwu-ugha nēgosi aghughọ.
18. O nwere onye nēkwu okwu nēchèghi echè dika ndupú nke mma-agha:Ma ire ndi mara ihe bu ihe nāgwọ madu.
19. Eb͕ub͕ere-ọnu ezi-okwu gēguzosi ike rue mb͕e ebighi-ebi:Ma nání rue otù ntabi-anya ka ire okwu-ugha di.
20. Aghughọ di n'obi ndi nēchèputa ihe ọjọ:Ma ndi nādu ọdu udo nwere ọṅù.
21. Ọ dighi ajọ ihe ọ bula gādakwasi onye ezi omume:Ma ndi nēmebi iwu ejuputawo n'ihe ọjọ.
22. Ihe-árú n'anya Jehova ka eb͕ub͕ere-ọnu okwu-ugha bu:Ma ndi ji ezi-okwu eme ihe bu ndi ihe-ha nātọ Ya utọ.
23. Madu nke nwere ezi uche nēkpuchi ihe-ọmuma:Ma obi ndi-nzuzu nākpọsa uche b͕agọrọ ab͕agọ.
24. Aka ndi di nkọ gāchi achi:Ma onye-ume-ngwu gādi n'usu ndi nēfè òfùfè.
25. Ncheb͕u n'obi madu nēme ka obi ruru ala;Ma okwu ọma nēme ka ọ ṅuria.
26. Onye ezi omume nēgosi madu-ibe-ya uzọ:Ma uzọ ndi nēmebi iwu nēme ka ha kpafue.
27. Onye-ume-ngwu adighi-aru anu ọ chutara na ntá:Ma àkù madu nke di oké ọnu-ahia diri onye di nkọ.
28. N'uzọ ezi omume ka ndu di;Ọzọ, n'uzọ nke okporo-uzọ-ya, ọ dighi ọnwu di ya.