1. Onye nāhu idọ-aka-na-nti n'anya nāhu ihe-ọmuma n'anya:Ma onye nākpọ iba-nba asì bu anu-ọhia.
2. Ezi madu gēnweputa n'aka Jehova na ihe-ya gātọ Ya utọ:Ma onye nzube ọjọ ka Ọ gāma ikpe.
3. Madu agaghi-eguzosi ike site na nmebi-iwu:Ma nkpọrọgwu ndi ezi omume, agaghi-eropu ya.
4. Nwanyi nke nējide onwe-ya nke-ọma bu okpu-eze di-ya:Ma ọ di ka ire-ure n'ọkpukpu di-ya, bú nwayi nēweta ihere.
5. Èchìchè nile nke ndi ezi omume bu ezi ikpé:Ma ndum-ọdu nile nke ndi nēmebi iwu bu aghughọ.
6. Okwu nile nke ndi nēmebi iwu bu iche anwu ọbara:Ma ọnu ndi ziri ezi gānaputa ha.
7. Asi na ekpùe ndi nēmebi iwu iru, ha anọghi kwa:Ma ulo ndi ezi omume gēguzo.
8. Dika ezi uche-ya si di ka agēto onye ọ bula:Ma onye b͕agọrọ ab͕agọ n'obi gāghọ onye anēleda.
9. Ọ di nma, bú onye anēlelì, ma o nwere orù,Kari onye nāsọpuru onwe-ya, ma nri kọrọ ya.