Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ilu 12:1-13 Bible Nso (IGBOB)

1. Onye nāhu idọ-aka-na-nti n'anya nāhu ihe-ọmuma n'anya:Ma onye nākpọ iba-nba asì bu anu-ọhia.

2. Ezi madu gēnweputa n'aka Jehova na ihe-ya gātọ Ya utọ:Ma onye nzube ọjọ ka Ọ gāma ikpe.

3. Madu agaghi-eguzosi ike site na nmebi-iwu:Ma nkpọrọgwu ndi ezi omume, agaghi-eropu ya.

4. Nwanyi nke nējide onwe-ya nke-ọma bu okpu-eze di-ya:Ma ọ di ka ire-ure n'ọkpukpu di-ya, bú nwayi nēweta ihere.

5. Èchìchè nile nke ndi ezi omume bu ezi ikpé:Ma ndum-ọdu nile nke ndi nēmebi iwu bu aghughọ.

6. Okwu nile nke ndi nēmebi iwu bu iche anwu ọbara:Ma ọnu ndi ziri ezi gānaputa ha.

7. Asi na ekpùe ndi nēmebi iwu iru, ha anọghi kwa:Ma ulo ndi ezi omume gēguzo.

8. Dika ezi uche-ya si di ka agēto onye ọ bula:Ma onye b͕agọrọ ab͕agọ n'obi gāghọ onye anēleda.

9. Ọ di nma, bú onye anēlelì, ma o nwere orù,Kari onye nāsọpuru onwe-ya, ma nri kọrọ ya.

10. Onye ezi omume mara ndu anu-ulo-ya:Ma obi-ebere nile nke ndi nēmebi iwu bu enweghi-obi-ebere.

11. Onye nālu ala-ubi-ya, afọ gēju ya na nri:Ma onye nāb͕aso ihe-efu di iche iche, obi amam-ihe kọrọ ya.

12. Onye nēmebi iwu achọsiwo ọnyà ndi ọjọ ike:Ma nkpọrọgwu ndi ezi omume nāmi nkpuru.

13. Na njehie nke eb͕ub͕ere-ọnu ka ọnyà onye ọjọ di:Ma onye ezi omume gēsi n'ahuhu puta.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ilu 12