Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ilu 1:3-15 Bible Nso (IGBOB)

3. Inara idọ-aka-na-nti nke inwe-uche,Na ezi omume na ikpé na izi-ezi;

4. Inye ndi nēnweghi uche ezi uche,Inye nwa-okorọbia ihe-ọmuma na ìzùzù:

5. Ka onye mara ihe we nu, we tukwasi ihe-nmuta n'amam-ihe-ya;Ka onye-nghọta we nweta kwa ezi ndum-ọdu:

6. Ighọta ilu, na okwu miri emi;Okwu nile nke ndi mara ihe, na okwu-omimi nile ha.

7. Egwu Jehova bu nmalite ihe-ọmuma:Amam-ihe na idọ-aka-na-nti ka ndi b͕agọrọ ab͕agọ n'uche ledaworo anya.

8. Nwam, nuru idọ-aka-na-nti nke nna-gi,Arapu-kwa-la iwu nne-gi:

9. N'ihi na okpu amara ka ha gāburu isi-gi,Ihe-inya-n'olu ka ha gāburu olu-gi.

10. Nwam, ọ buru na ndi-nmehie arà gi urà,Ekwela.

11. Ọ buru na ha asi, Soro ayi je,Ka ayi che anwu ọbara,Ka ayi zobe onwe-ayi ijide onye nēmeghi ihe ọjọ n'efu;

12. Ka ayi lo ha na ndu dika ala-mọ,Bú ndi zuru okè, dika ndi nārida n'olùlù;

13. Ihe nile di oké ọnu-ahia ka ayi gāchọta,Ayi gākwaju ulo-ayi nile n'ihe ayi kwatara n'agha;

14. Nzà-gi ka i gēfe n'etiti ayi;Otù akpa-ego ka ayi nile gēnwekọ:

15. Nwam, esola ha je n'uzọ;B͕ochie ukwu-gi n'iga n'okporo-uzọ-ha:

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ilu 1