isiakwụkwọ

  1. 1
  2. 2
  3. 3
  4. 4
  5. 5
  6. 6
  7. 7
  8. 8
  9. 9
  10. 10
  11. 11
  12. 12
  13. 13
  14. 14

Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Hosea 6 Bible Nso (IGBOB)

1. Bianu, ka ayi laghachikute Jehova: n'ihi na Ya onwe-ya adọkawo, Ọ gāgwọ kwa ayi; O tib͕uwo, Ọ gēkechi kwa ayi.

2. Ọ gēme ka ayi dighachi ndu mb͕e ubọchi abua gasiri: n'ubọchi nke-atọ ka Ọ gēme ka ayi bilie, ayi ewe di ndu n'iru Ya.

3. Ka ayi mara kwa, ka ayi b͕aso imara Jehova; dika chi-ọbubọ, otú a ka ọpupu-Ya guzosiworo ike: Ọ gābiakute kwa ayi dika oké miri-ozuzo, dika miri-ozuzo ikpe-azu nke nēzosa ala.

4. Gini ka M'gēme gi, Efraim? gini ka M'gēme gi, Juda? n'ihi na ebere-unu di ka igwe-oji ututu, na dika igirigi nke nāla n'isi-ututu.

5. N'ihi nka ka M'jiworo ndi-amuma b͕utue ha; ejiwom okwu nile nke ọnum b͕ue ha: ikpé-gi nile di kwa ka ìhè nke nāputa aputa.

6. N'ihi na ebere atọwom utọ, ọ bughi àjà; ọmuma Chineke atọwokwam utọ kari àjà-nsure-ọku nile.

7. Ma ndi ahu agabigawo pua n'ọb͕ub͕a-ndum, dika Adam: n'ebe ahu ka ha ghọb͕uworom.

8. Gilead bu obodo nke ndi nālu ajọ ihe, nke ewereworo ọbara zọtọsia ya.

9. Ọzọ, dika usu ndi nāpunara madu ihe nēche anwu onye ọ bula, otú a ka òtù ndi-nchu-àjà nēb͕u madu n'uzọ Shekem: e, ajọ ihe-nzube ka ha meworo.

10. N'ulo Israel ka M'huworo ihe jọb͕uru onwe-ya: n'ebe ahu ka ikwa-iko nke Efraim nākwa di, emeruwo Israel.

11. Ọzọ, gi Juda, akaworo gi owuwe-ihe-ubi àkà, mb͕e M'gēme ka ndim adọtara n'agha lata.