isiakwụkwọ

  1. 1
  2. 2
  3. 3
  4. 4
  5. 5
  6. 6
  7. 7
  8. 8
  9. 9
  10. 10
  11. 11
  12. 12
  13. 13
  14. 14

Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Hosea 3 Bible Nso (IGBOB)

1. Jehova we sim, Je kwa, hu nwanyi n'anya nke iko huworo ya n'anya, nke bu kwa nwanyi aluru na nwunye nākwa iko, dika Jehova si ahu umu Israel n'anya, ọ bu ezie na ha onwe-ha nēche iru na chi ọzọ di iche iche, nāhu kwa mbadamba nkpuru-vine amiri ami n'anya.

2. M'we were ego ọla-ọcha iri na ise, na otù homer ọka barley, na nkera homer ọka barley, gotara ya onwem:

3. m'we si ya, Ọtutu ubọchi ka i gānọdurum; i gaghi-akwa iko, i gaghi-abu kwa nwan yi nke nwoke ọ bula: Mu onwem gādi kwa otú a n'ebe i nọ.

4. N'ihi na ọtutu ubọchi ka umu Israel gānọdu nēnweghi eze, nēnweghi kwa onye-isi, nēnweghi kwa àjà, nēnweghi kwa ogidi, nēnweghi kwa ephod na teraphim: